Tinye Ọnụ n'Okwu a biko nụ,
Ọ na-abụ arụ gbaa afọ, ọ bụrụ omenaala. Kedụ mgbe ndị mba ndị ọzọ malitere iliri anyị bụ ndị Igbo ozu onye nke anyị nwụrụ anwụ; ọ bụ ịda mbà, ka ọ bụ na ụmụokorobịa akọlaghịla anyị n'obodo? N'izu ụka ndị a gara aga, a chọpụtara m na obodo abụọ dị na Njikọka, ndị ugwu ka a kwụrụ ụgwọ, igwu, ma lie onye nwụrụ anwụ.
Ụsa otu onyeisi ógbè nyere m, bụ na ezinuụlọ ahụ, adịghị ajụ ndị ụlọ ase maọbụ sonyere ha, makana ha anọghị nso. Mana, ọ bụ ya kpatara a ga-eji gote ndị ọrụ ngo? Obodo ọbụla nwere iwu, nke onye dara, sị daa ya nha! Ndị chere na ha adịghị enwe efe, marakwa na Apịa fecha n'elu, ọ lata n'ala kpaa nri. Okenye anaghị anọ n'ụlọ Ewu amụọ n'ọgbịrị. Ọ bụkwa onye kpatara nkụ ahụhụ sị Ngwere bịa ọrịrị. Anyị akwanyereghị ndị nwụrụ anwụ ugwu, onye ga-akwanyere ndị dị ndụ ugwu nke ha, ma asị na ọnwụ a kpọọ ha òkù? N'agbanyeghị nke a, ọ bụ sọ onye ara kwuru na ọ nweghịkwa ihe ọ ga-agwa onye ji mma fere ya n'azụ, na ọ bụ mgbe ọ chọrọ isi ya achọ. N'ikpeazụ, ọkụkọ na-akpa nri, anya uhie akọkwala ya. Ndeewo nụ ndị ọma m ji eme ọnụ.
N'omenala Igbo, ọ bụ oké na ọrụ ndị ụmụnna ili nwanne ha nwoke maọbụ nwaanyị lara mmụọ. Ọ bụ nke a mere n'oge gboo, a na-ebula ozu nwada ụlọ nna ya ka e wee hụ na e doziri ma likwa ozu ya nke ọma.
N'oge ugbu a, ọ bụ eziokwu na ụmụ okorobịa adịghịkwa ike otu ha dị n'oge gara aga n'ihi anwụrụ ike na oké mmanya ha na-aṅụ, mana ọ nwere ihe abụọ m na-eche mere na ha agaghị apụta bịa guo ili ma budakwa nwanne ha lara mmụọ n'ili.
1. Onye mere arụ maọbụ nsọala. Anyi maara n'oge oge ochie, onye mere arụ dịka igbu mmadụ, inwe nwekọ nke ibeene maọbụ bọọ ji, tụbie ome ji maọbụ mee…